Abụ Ọma 10
Arịrịọ maka ikpe ziri ezi
Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?
Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
 
Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,
ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,
ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,
nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.
Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ;
ọ na-elelị ndị iro ya niile.
Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.
Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”*
 
Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,
nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,
nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ,
na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.
Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,
ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye.
Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
10 Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,
ọ na-azọpịakwa ha.
11 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola.
O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”
 
12 Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,
echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.
13 Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?
Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya,
“Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?
14 Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha.
Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
15 Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile
nke a na-apụghị ịchọpụta.
 
16  Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
17 O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
18 Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,
ka mmadụ efu, onye e kere eke,
ghara imenye ha egwu ọzọ.
* Abụ Ọma 10:6 10:6 Ọ na-asị nʼime obi ya, “Agaghị ewezuga m nʼọnọdụ m”; Ọ na-aṅụkwa iyi sị, “Ọ dịghị onye ọbụla ga-eme m ihe ọjọọ” Abụ Ọma 10:7 10:7 Ya bụ, ịgba iyi Abụ Ọma 10:11 10:11 O mechiri anya ya, ọ naghị ahụ ya