Abụ Ọma 9
Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid.
Ekele nʼihi nnapụta Chineke
O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
 
Ndị iro m na-alaghachi azụ,
ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,
I hopukwala obodo ha niile.
Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
 
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
10  Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
 
11 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
12 Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
 
13 O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
14 ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
nʼọnụ ụzọ ama* niile nke ada Zayọn,
nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
 
15 Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
16 Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;
ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya.
Sela
17 Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;
nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.
18 Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;
olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
 
19 O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;
ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
20 O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;
mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ.
Sela
* Abụ Ọma 9:14 9:14 Ọ bụ nʼụzọ ama obodo ka a na-anọ akparị ụka niile dị mkpa. Rut 4:1