Abụ Ọma 100
Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju.
Toonu Chineke
Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;
jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.
Ọ bụ ya onwe ya kere anyị,* ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
 
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
* Abụ Ọma 100:3 100:3 Job 10:3; Efe 2:10