Abụ Ọma 99
Toonu Chineke dị nsọ
Onyenwe anyị bụ eze,
ka mba niile maa jijiji!
O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim,
ka elu ụwa maa jijiji.
Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn;
ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.
Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu,
ọ dị nsọ.
 
Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya,
i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike;
nʼime Jekọb ka i mere
ihe ziri ezi na ihe dị mma.
Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,
feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;
ọ dị nsọ.
 
Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya,
Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya;
ha kpọkuru Onyenwe anyị
ọ zakwara ha.
Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii.
Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.
 
O Onyenwe anyị, Chineke anyị,
ị zara ha;
ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie,
nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu;
na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ,
nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.