Abụ Ọma 104
Toonu Chineke onye okike
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
 
O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu;
ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.
 
Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;
ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.*
Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha
na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,
meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
 
Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;
agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,
mmiri tokpukwara ugwu niile.
Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,
nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.
Ha sitere nʼelu ugwu niile,
sọrọ gaa na ndagwurugwu,
ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.
Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,
gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.
 
10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,
meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ
bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.
12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;
nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.
13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;
ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.
14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,
na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,
ime ka nri site nʼala pupụta;
15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,
mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,
na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
16 A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,
osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;
nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;
nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
 
19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;
anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;
ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,
ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.
22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,
ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,
kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.
 
24  Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.
Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha.
Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;
jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi,
anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,
nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
 
27 Ha niile na-adabere na gị,
ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
28 Ị na-enye ha nri;
ha na-erikwa ya.
Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,
afọ na-eju ha nke ọma.
29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,
egwu na-eju ha obi.
Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,
ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,
a na-eke ha;
ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
 
31 Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;
ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,
onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
 
33 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;
aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,
dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.
Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ.
 
Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m!
 
Toonu Onyenwe anyị!
* Abụ Ọma 104:3 104:3 Ems 9:6