Abụ Ọma 105
Toonu Chineke onye na-edebe ọgbụgba ndụ
Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya.
Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto;
kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
 
Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya,
unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
ikpe ya dị nʼụwa niile.
 
Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,
bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara
na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
10 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
11 “Aga m enye gị ala Kenan
dịka oke i ga-eketa.”
 
12 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
13 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ,
sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
14 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
15 sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka;
unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
 
16 O zitere ụnwụ nʼala ahụ,
bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
17 o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha,
Josef, onye e refuru dịka ohu.
18 Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ,
nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
19 tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru,
tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
20 Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya,
onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
21 O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya,
onye na-achị ihe niile o nwere,
22 ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya,
na izi ndị okenye ya amamihe.
 
23 Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt;
Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
24  Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu;
o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
25 ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị,
ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
26 O zipụrụ Mosis, ohu ya,
na Erọn, onye ọ họpụtara.
27 Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha,
ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
28 O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị,
nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
29 O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara,
nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
30 Ala ha niile jupụtara nʼawọ
ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
31 O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta
dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
32 Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha
mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
33 o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha,
kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
34 O kwuru okwu, igurube na ụkpana
a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
35 ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ,
ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
36 Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ,
mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
37 Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo,
ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
38 Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ,
nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
 
39 Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,
na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
40 Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,
jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
41 O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;
ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
 
42 Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ,
nke o kwere ohu ya Ebraham.
43 O ji aṅụrị dupụta ndị ya,
jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
44 o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche,
ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
45 ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile
ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
 
Toonu Onyenwe anyị.