Nchịkọta nke ise
107
Abụ Ọma 107–150
Ekele maka Chineke onye na-anapụta
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma;
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a,
ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche,
site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
 
Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu,
ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.
Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ,
olileanya gwụrụ ha nʼobi.
Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha,
ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.
O duuru ha nʼụzọ ziri ezi
baa nʼobodo ha ga-ebi.
Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ
meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.
 
10 Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi,
ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,
11 nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke
ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
12 Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ,
ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
13 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,
ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
14 O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta.
O tijikwara agbụ ha niile.
15 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
16 nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ
gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.
 
17 Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi
taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
18 Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ
ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
19 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha
ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.
20 O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha;
ọ napụtara ha site nʼili.
21 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
22 Ka ha chụọ aja ekele nye ya
jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.
 
23 Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri;
ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.
24 Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị,
ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.
25 Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo
nke buliri ebili mmiri elu.
26 Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile;
nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.
27 Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke.
Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.
28 Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,
o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.
29 O mere ka oke ifufe dere duu;
o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
30 Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ,
o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
31 Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
32 Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ
ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.
 
33 Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara;
na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.
34 Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara,
nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.
35 Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara
mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ;
36 ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri,
ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi.
37 Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị
ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
38 ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba,
o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.
 
39 Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ,
ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
40 onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya
mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
41 Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha,
mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
42 Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ,
ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu.
 
43 Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a,
ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.