Abụ Ọma 106
Toonu Chineke onye ebere
Toonu Onyenwe anyị.
 
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ
maọbụ kwupụta otuto ya niile?
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi,
ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
 
O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma,
bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara,
ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị
sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
 
Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere;
anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt,
ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile;
ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile,
kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya,
ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa;
o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
10 Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị;
gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
11 Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile;
ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
12 Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile,
ma bụkuo gị abụ otuto.
 
13 Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ,
ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
14 Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha;
nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
15 Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya,
ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
 
16 Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis
na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
17 Ala meghere loda Datan,
o likwara Abiram, na ndị otù ya.
18 Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha;
ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
19 Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi,
kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
20 Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa
gbanwere Ebube ha.
21 Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha,
onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
22 ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham,
na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
23 Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi,
ma Mosis, onye ya ọ họpụtara,
guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke,
ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
 
24 Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya,
ha ekwenyeghị na nkwa ya.
25 Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha;
ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
26 Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi
na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
27 mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche,
ma chụsasịa ha nʼala niile.
 
28 Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa,
riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
29 ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe,
nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
30 Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi,
ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
31 A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32 Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe,
nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
33 nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke,
Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.
 
34 Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ
dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
35 Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ,
site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
36 Ha fere arụsị ha ofufe,
nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
37 Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị
inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.*
38 Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla,
ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom,
bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan,
si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
39 Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha;
site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.
 
40 Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya;
ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
41 Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche,
ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
42 Ndị iro ha mekpara ha ahụ
chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
43 Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha,
ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya,
bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
44 Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha,
ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
45 nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya,
sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
46 Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha
nwee ọmịiko nʼahụ ha.
 
47 O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị,
chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.
 
 
48 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
 
Ka mmadụ niile sị, “Amen!”
 
Toonu Onyenwe anyị.
* Abụ Ọma 106:37 106:37 Maọbụ, ajọ mmụọ