Abụ Ọma 115
Nyenụ Chineke otuto
Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị,
kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị,
nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
 
Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”
Chineke anyị bi nʼeluigwe.
Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha,
ha bụ ọrụ aka mmadụ.
Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu,
ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe,
ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka,
ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije;
ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha.
Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
 
Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
10 Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi.
Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
11 Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
 
12  Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị,
ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel,
ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
13 ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
ma onye nta ma onye ukwu.
 
14 Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa,
unu na ụmụ unu.
15 Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa
gọzie unu.
 
16 Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị,
ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
17 Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị,
ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
18 ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma,
site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
 
Toonu Onyenwe anyị.