Abụ Ọma 116
Chineke na-anapụta
Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;
ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
Nʼihi na o gere m ntị,
aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
 
Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,
oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m;
nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.
Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:
“O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
 
Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.
Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;
mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
 
Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,
nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
 
Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,
anya m site na anya mmiri akwa,
napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị
nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
 
10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,
“Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
 
12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
 
13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ
mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
 
15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya
dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
16 O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;
abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị;
ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
 
17 Aga m achụrụ gị aja ekele
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile
ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,
nʼetiti gị, O Jerusalem.
 
Toonu Onyenwe anyị.