Abụ Ọma 130
Abụ nrigo.
Mkpụrụobi na-ele anya Chineke
O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.
Onyenwe anyị, nụrụ olu m.
Ka ntị gị na-aṅakwa ntị
nʼolu arịrịọ m, maka amara.
 
O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile,
Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?
Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie* dị;
ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.
 
Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
 
Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,
nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel
site na mmehie ya niile.
* Abụ Ọma 130:4 130:4 Ọpụ 34:7; Neh 9:17; Dan 9:9