Abụ Ọma 131
Abụ nrigo, nke Devid.
Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi
O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,
ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;
adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m
maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;
dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,
e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
 
Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị*
ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
* Abụ Ọma 131:3 131:3 Abụ 130:7