Abụ Ọma 63
Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda.
Onye ihe Chineke na-agụsị agụụ ike
O Chineke, ị bụ Chineke m,
e ji m obi m niile na-achọ gị;
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,
anụ ahụ m na-achọsi gị ike,
nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba
ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
 
Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị,
hụkwa ike gị na ebube gị.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,
aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.
Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ;
aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
 
Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị,
ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m,
ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.
Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ;
aka nri gị na-ejigide m.
 
A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi;
ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.
10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi,
ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.
 
11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;
ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,
ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.