Abụ Ọma 64
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka nchekwa
Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.
Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.
 
Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,
site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.
Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,
na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.
Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,
na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.
 
Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,
ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo,
ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya*?”
Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,
“Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!”
Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.
 
Ma Chineke ga-agba ha àkụ,
na mberede ka a ga-etida ha.
Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,
mee ka ha laa nʼiyi;
ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.
Mmadụ niile ga-atụ egwu,
ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke,
ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.
 
10 Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,
ha ga-agbabakwa nʼime ya;
ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.
* Abụ Ọma 64:5 64:5 Maọbụ, onye ga-ahụ anyị