Abụ Ọma 65
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ.
Ịdị mma na ịdị ike nke Chineke
I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn;
ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
O gị onye na-anụ ekpere,
ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,*
Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị,
ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara,
ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị!
E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị,
mee ka afọ ju anyị.
 
O Chineke, Onye nzọpụta anyị,
i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị,
ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa,
na osimiri niile dị ebe dị anya,
onye ji ike ya kpụọ ugwu niile,
ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
onye mere ka ụda olu oke osimiri niile
na ụda olu ebili mmiri,
na ọgbaaghara mba niile deere duu.
Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile,
nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada,
ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
 
Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri;
ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma.
Isi iyi Chineke adịghị ata ata,
nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi,
nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
10 Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị;
ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
11 Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze,
ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
12 Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ,
e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
13 E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru,
ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile;
ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.
* Abụ Ọma 65:2 65:2 Aịz 66:23