Abụ Ọma 67
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ.
Abụ ekele
Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,
ma mee ka ihu ya chakwasị anyị,*
Sela
Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,
marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
 
Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị.
Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,
nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,
na-edukwa mba niile nke ụwa.
Sela
Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị.
 
Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,
Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
Chineke ga-agọzi anyị,
nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
* Abụ Ọma 67:1 67:1 Ọnụ 6:25