Abụ Ọma 68
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ.
Chineke nke ụwa niile
Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;
ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga.
Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ,* sikwa otu a chụsaa ha.
Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ,
ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke.
Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ,
ma ṅụrịa nʼihu Chineke;
ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.
 
Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,
toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,
Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ,
ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,
ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.
 
Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke,
mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu,
Sela
elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo,
nʼihu Chineke, Onye Saịnaị,
nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke,
i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ.
10 Ndị gị biri nʼime ya,
site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha.
 
11 Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ,
ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ;
12 ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa;
ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.
13 Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ,
nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie,
jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.
14 Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a,
ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.
 
15 Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu,
ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche.
16 Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo
nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa,
ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?
17 Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha;
ha dịkwa puku kwụrụ puku;
Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.
18 Mgbe i rigoro gaa nʼelu,
i duuru ndị a dọtara nʼagha;
ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ,
ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi,
ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ.
 
19 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị,
Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile.
Sela
20 Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta;
mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
21 Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile,
isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie.
22 Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha,
aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri,
23 ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu,
ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.”
 
24 O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị,
bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ.
25 Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ;
ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha.
26 Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ;
toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.
27 Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha,
lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda
na nke Zebụlọn na Naftalị.
 
28 O Chineke, kpọlite ike gị;
mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.
29 Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem,
ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
30 Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba,
igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile.
Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha.
Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.
31 Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa,
Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.
 
32 Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa,
bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto,
Sela
33 Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie,
onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.
34 Kwusaa ike Chineke,
onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel,
onye ike ya dị nʼeluigwe.
35 O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị;
Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike.
 
Toonu Chineke!
* Abụ Ọma 68:2 68:2 Hos 13:3 Abụ Ọma 68:18 68:18 Mak 16:19; Ọrụ 1:9; Kọl 3:1 Abụ Ọma 68:18 68:18 Nkp 5:12; Efe 4:8