Abụ Ọma 69
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Eji olu abụ “Okoko Lili.” Abụ Devid.
Ekpere maka nnapụta
O Chineke, zọpụta m,
nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.
Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,
e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị.
Abịala m nʼebe mmiri dị omimi;
uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
Akpịrị akpọọla m nkụ;
ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.
Anya m agbaala ọchịchịrị
ebe m na-ele anya Chineke.*
Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
karịa agịrị isi dị m nʼisi.
Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,
bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.
Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi
ihe m na-ezughị nʼohi.
 
Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;
ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.
 
Ekwela ka ihere mee ndị
na-atụkwasị gị obi nʼihi m,
O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
ka ndị na-achọ gị
ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,
O Chineke nke Izrel.
Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,
ihere ekpuchiela m ihu.
Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,
nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,
ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.
10 Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,
ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.
11 Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,
a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.
12 Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.
 
13 O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,
nʼoge ihuọma gị;
na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,
zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
14 Dọpụta m site nʼụrụrọ,
ekwela ka m mikpuo;
zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,
site na mmiri miri emi.
15 Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,
maọbụ ka ebe dị omimi loda m,
ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.
 
16 O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,
nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
17 Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.
Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
18 Bịa m nso zọpụta m.
Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
 
19 Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere:
ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.
20 Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,
ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka.
Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ;
lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.
21 Ha tinyere oluilu nʼime nri m,
nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.
 
22 Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya;
ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
23 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ,
mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.
24 Wụkwasị ha oke iwe gị,
ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
25 Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.
26 Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ,
na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.
27 Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume,
ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.
28 Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ,
ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.
 
29 Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu,
O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.
 
30 Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,
jirikwa ekele bulie ya elu.
31 Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi,
karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
32 Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ;
unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.
33  Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa,
ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.
 
34 Ka eluigwe na ụwa too ya,
osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.
35 Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn;
ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda.
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.
36 Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya,
ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.
* Abụ Ọma 69:3 69:3 Abụ 119:82,123 Abụ Ọma 69:27 69:27 Maọbụ, nzọpụta