Abụ Ọma 7
Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin.
Arịrịọ maka ikpe ziri ezi
Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara;
zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm,
ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
 
O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a;
ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ,
maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m;
ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m,
mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma.
Sela
 
Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị,
bilie megide oke iwe ndị iro m;
teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu,
ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe.
Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị,
na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
O Chineke onye ezi omume,
onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ,
mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe
meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
 
10 Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta* m,
ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
11 Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
12 Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị,
ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ,
ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
13 Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ;
ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
 
14 Onye ọbụla dị ime ajọ ihe,
na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
15 Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba
nʼime olulu ahụ o gwuru.
16 Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya
ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
 
17 Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,
aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
* Abụ Ọma 7:10 7:10 Maọbụ, Onyenwe m Abụ Ọma 7:14 7:14 Nʼoge ochie, ndị agha izipụta echiche ime ajọ ihe ha, na-eji ihe na-aghọrọ ọkụ ọsịịsọ, techie nʼọnụ àkụ ha, mụnye ha ọkụ, tụnye ha nʼelu ụlọ ndị iro ha, i gbaa ha ọkụ.