Abụ Ọma 8
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit.
Ịdị ebube Chineke na nsọpụrụ nke mmadụ
O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!
 
I meela ka ebube gị dị elu
nʼime eluigwe.
Site nʼotuto* ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha,
gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?
 
I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi§ nọ,
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,
tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
na nnụnụ niile,
na azụ niile,
na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
 
O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
* Abụ Ọma 8:2 8:2 Mat 21:16 Abụ Ọma 8:4 8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi Abụ Ọma 8:5 8:5 Maọbụ, ya § Abụ Ọma 8:5 8:5 Maọbụ, Chineke