Abụ Ọma 74
Abụ maskil nke Asaf.
Ekpere maka enyemaka
Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?
Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie,
ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara,
nʼugwu Zayọn ebe i biri.
Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a.
Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
 
Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị.
Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike
ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
Ha ji anyụike na egbugbu ha
kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa.
Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!”
Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
 
Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke.
Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ.
Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
10 O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị?
Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
11 Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị?
Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
 
12 Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie.
Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
 
13 Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ.
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
14 Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan,
mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
15 Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ.
I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
16 Ehihie na abalị bụ nke gị.
I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
17 Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa.
Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
 
18 O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị,
na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
19 Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka.
Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
20 Chetakwa ọgbụgba ndụ gị,
nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
21 Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere;
ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
22 O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe.
Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
23 Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya,
olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.