Abụ Ọma 75
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke
Anyị na-eto gị, O Chineke.
Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.
Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
 
Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka.
Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji,
ọ bụ m na-ejidesi ogidi* ya ike ka o guzo chịm.
Sela
Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ,
nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.
Unu ewelila mpi unu megide eluigwe;
unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”
 
Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,
maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;
ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị
nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.
Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa
na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
 
Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
10 bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,
ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
* Abụ Ọma 75:3 75:3 Ya bụ, ntọala Abụ Ọma 75:4 75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a