Abụ Ọma 77
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma.
Nkasiobi nʼoge nsogbu
Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;
etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.
Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị,
mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
 
O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;
echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba.
Sela
I kweghị ka anya m abụọ mechie;
nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,
na afọ niile ndị gara aga.
Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
 
“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?
Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?
Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?
O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?”
Sela
 
10 Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,
afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
 
13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.
Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;
ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,
bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef.
Sela
 
16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke,
osimiri hụrụ gị, taa;
ogbu mmiri mere mkpọtụ.
17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri,
mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe;
àkụ gị gburu amụma ebe niile.
18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,
amụma gị nyere ụwa niile ihe;
elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,
ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri,
ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
 
20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn
duo ndị gị dịka igwe atụrụ.