Abụ Ọma 76
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ike mmeri nke Chineke
A maara Chineke nʼobodo Juda;
aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
Ụlọ ikwu ya dị na Salem,
ebe obibi ya dị na Zayọn
Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,
na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile.
Sela
 
Ị jupụtara nʼìhè,
ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,
ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;
o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a
pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,
ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.*
 
Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.
Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,
ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a.
Sela
10 Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,
ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.
 
11 Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;
ka ndị ala niile bụ agbataobi unu
wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
12 Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;
ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
* Abụ Ọma 76:6 76:6 Ọpụ 15:1-6 Abụ Ọma 76:10 76:10 Ọpụ 9:16-18; Rom 9:17