Abụ Ọma 88
Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra.
Akwa maka enyemaka
O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m,
nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.
Ka ekpere m bịa nʼihu gị.
Chee ntị gị nụrụ akwa m.
 
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m,
anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.
Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu.
Adị m dịka onye na-enweghị ike.
A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,
dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili,
ndị ị nakwaghị echeta ọzọ,
ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.
 
Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,
olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.
Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;
i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m.
Sela
Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,
mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.
Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;
anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.
 
O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;
ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
10 ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?
Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị?
Sela
11 Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?
A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
12 A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị?
Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?
 
13 Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku.
Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.
14 O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m?
Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?
 
15 Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso;
ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.
16 Oke iwe gị agabigala nʼahụ m;
ihe egwu gị alaala m nʼiyi.
17 Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri;
ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.
18 Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya;
ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.