Abụ Ọma 89
Abụ maskil nke Etan, onye Ezra.
Ọgbụgba ndụ Chineke na Devid
Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi;
aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara
maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.
Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi
meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ”
Sela
 
O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,
na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị?
Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?
Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;
ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?
Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
 
Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike;
aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
 
14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;
ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,
ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;
ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,
site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị,
eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
 
19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,
nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị:
“Enyela m otu onye dị ike agha ike;
Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
20 Achọtala m Devid ohu m,
were mmanụ nsọ m tee ya.
21 Aka m ga-agba ya ume;
nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;
ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.
Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,
site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,*
dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,
bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
27 Aga m eme ya nwa mbụ m,
onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi,
ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,
ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.
 
30 “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya,
gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya,
hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha,
tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ.
Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m.
Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie
na m apụghị ịghara Devid ụgha,
36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa.
E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.”
Sela
 
38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa,
i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara
i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu,
i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.
41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.
Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.
42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;
mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.
43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,
i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa.
Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.
45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.
I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.
 
46 Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị?
Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.
Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,
maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili?
Sela
49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,
nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,
otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
51 O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,
nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
 
 
52 Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Amen na Amen.
* Abụ Ọma 89:25 89:25 Ọ ga-achị oke osimiri na osimiri niile Abụ Ọma 89:25 89:25 Oke osimiri na osimiri niile a na-ekwu banyere ha nʼebe a, bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis, na osimiri ndị ọzọ niile na-asọbanye nʼime ha. Oke ala ochie ahụ e kwere Devid na Solomọn na nkwa jedebere nʼosimiri ndị a. Abụ Ọma 89:48 89:48 Ya bụ, ala mmụọ