6
Ụmụ ụmụ Livayị
Livayị mụrụ ndị a:
Geshọn, Kohat na Merari.
Kohat mụrụ
Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
Amram mụrụ
Erọn, Mosis na Miriam.
Erọn mụrụ
Nadab, Abihu, Elieza na Itama.
Elieza mụrụ Finehaz;
Finehaz abụrụ nna Abishua
Abishua bụ nna Buki,
Buki abụrụ nna Uzi.
Uzi mụrụ Zerahaya,
Zerahaya amụọ Meraiot.
Meraiot mụrụ Amaraya,
Amaraya amụọ Ahitub.
Ahitub mụrụ Zadọk,
Zadọk amụọ Ahimaaz.
Ahimaaz mụrụ Azaraya,
Azaraya amụọ Johanan.
10 Johanan mụrụ Azaraya
ọ bụ ya bụ onye ahụ bụ onye nchụaja ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru na Jerusalem.
11 Azaraya mụrụ Amaraya,
Amaraya amụọ Ahitub.
12 Ahitub mụrụ Zadọk,
Zadọk amụọ Shalum.
13 Shalum mụrụ Hilkaya,
Hilkaya amụọ Azaraya.
14 Azaraya mụrụ Seraya,
Seraya amụọ Jehozadak,
15 A dọtara Jehozadak nʼagha mgbe Onyenwe anyị mere ka Nebukadneza dọkpụrụ ndị Juda na Jerusalem nʼagha.
 
16 Ụmụ ndị ikom Livayị bụ,
Geshọm, Kohat na Merari.
17 Geshọm mụrụ
Libni na Shimei.
18 Ụmụ Kohat bụ
Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel.
19 Merari mụtara
Mahali na Mushi.
 
Ndị a bụ ikwu Livayị ndị e depụtara dịka aha nna ha si dị.
20 Ikwu Geshọm bụ
Libni, Jahat,
Zima, 21 Joa,
Ido, Zera
na Jeaterai.
22 Ikwu Kohat bụ
Aminadab, Kora,
Asịa, 23 Elkena,
Ebiasaf, Asịa,
24 Tahat, Uriel,
Ụzaya na Shaul.
25 Ụmụ ụmụ Elkena bụ
Amasai na Ahimot.
26 Ụmụ ụmụ Ahimot bụ
Elkena, Zofai, Nahat, 27 Eliab,
Jeroham, Elkena
na Samuel.
28 Ụmụ Samuel bụ
Juel, ọkpara ya,
na Abija nke abụọ.
29 Ụmụ ụmụ Merari bụ
Mahali, Libni,
Shimei, Ụza,
30 Shimea, Hagiya
na Asaya.
Ndị na-abụ abụ nʼụlọnsọ ukwu
31 Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara nye ọrụ ilekọta ndị ọbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ. 32 Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.
 
33 Ndị a bụ ndị ikom ahụ jere ozi, ha na ụmụ ha ndị ikom:
 
Site nʼikwu Kohat:
Heman, ọbụ abụ.
Ndị a bụ nna nna ya ochie: Juel, nwa Samuel,
34 nwa Elkena, nwa Jeroham,
nwa Eliel, nwa Toa,
35 nwa Zuf, nwa Elkena,
nwa Mahat, nwa Amasai,
36 nwa Elkena, nwa Juel,
nwa Azaraya, nwa Zefanaya,
37 nwa Tahat, nwa Asịa,
nwa Ebiasaf, nwa Kora,
38 nwa Izha, nwa Kohat,
nwa Livayị, nwa Izrel.
39 Asaf onye na-enyere Heman aka, na-eje ozi nʼakụkụ aka nri ya.
Ndị bụ nna nna ya ochie bụ ndị a: Berekaya, nwa Shimea,
40 nwa Maikel, nwa Baaseya,
nwa Malkija, 41 nwa Etni,
nwa Zera, nwa Adaya,
42 nwa Etan, nwa Zima,
nwa Shimei, 43 nwa Jahat,
nwa Geshọm, nwa Livayị.
44 Onye ọzọ na-enyere Heman aka bụ Etan, onye ikwu Merari. Ọ na-anọ nʼaka ekpe ya.
Ndị bụ nna nna ochie Etan bụ ndị a, Kishi, nwa Abdi,
nwa Maluk, 45 nwa Hashabaya,
nwa Amazaya, nwa Hilkaya,
46 nwa Amzi, nwa Bani,
nwa Shema, 47 nwa Mahali,
nwa Mushi, nwa Merari,
nwa Livayị.
 
48 Ụmụnna ha ndị Livayị ụfọdụ ka e tinyere nʼọrụ dị iche iche nʼụlọ ikwu, bụ ụlọ Chineke. 49 Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.
 
50 Ụmụ ụmụ Erọn bụ
Elieza, na Finehaz,
na Abishua, 51 na Buki,
na Uzi, na Zerahaya,
52 na Meraiot, na Amaraya,
na Ahitub, 53 na Zadọk,
na Ahimaaz.
 
54 Ndị a bụ ala na obodo dị iche iche ụmụ Erọn ketara, nke e nyere ikwu Kohat, ụmụ ụmụ Erọn, nʼihi na ọ bụ ha ka e bu ụzọ kenye oke site nʼife nza.
55 Hebrọn, nʼime Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ niile dị ya gburugburu. 56 Ma ala ubi na obodo nta niile gbara Hebrọn gburugburu ka e nyere Kaleb nwa Jefune. 57 Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa, 58 na Hilen, na Debịa, 59 na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
60 Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.
 
61 E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.
62 E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.
63 E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
 
64 Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.
 
65 Site nʼebo Juda, na Simiọn, na Benjamin ka e si kenye ha obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha na mbụ.
 
66 E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
67 Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza, 68 na Jokmeam, na Bet-Horon, 69 na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
70 Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
 
71 Ndị Geshọm natara obodo ndị a:
Site nʼagbụrụ ọkara ebo Manase ha natara Golan, nke dị na Bashan, na Ashtarọt, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
72 Ebo Isaka nyere ha Kedesh, Daberat, 73 Ramọt na Anem, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
74 Ebo Asha nyere ha Mashal, Abdon, 75 Hukọk na Rehob, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
76 Ebo Naftalị nyere ha Kedesh nʼime Galili, Hamọn na Kiriatem, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
 
77 Ndị ebo Zebụlọn nyere ụmụ Merari ndị Livayị fọdụrụ ala ndị a:
Jokneam, Kata, Rimọn na Taboa, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
78 Ma nʼofe osimiri Jọdan, nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko, ndị ebo Ruben nyere ha obodo Beza dị nʼọzara, nyekwa ha Jahaz, 79 Kedemot na Mefaat, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
80 Ndị ebo Gad nyere ha Ramọt nke Gilead, Mahanaim, 81 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.