7
Ụmụ ụmụ Isaka
Isaka mụrụ ụmụ anọ:
Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a:
Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii. (22,600).
Uzi mụrụ
Izrahaya.
Izrahaya amụta ndị a:
Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha. Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii (36,000), nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa (87,000) nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Ụmụ ụmụ Benjamin
Benjamin mụrụ ndị ikom atọ:
Bela, Beka na Jediael,
Bela mụrụ ụmụ ise:
Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ (22,034). E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ
Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet. Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
10 Jediael mụrụ otu nwa nwoke:
aha ya bụ Bilhan.
Ụmụ Bilhan bụ
Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha. 11 Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
12 Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
Ụmụ ụmụ Naftalị
13 Ụmụ Naftalị mụtara bụ
Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
Ụmụ ụmụ Manase
14 Ụmụ Manase:
Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead. 15 Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom. 16 Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
17 Nwa nwoke Ụlam mụtara
bụ Bedan.
Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
18 Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19 Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a:
Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
Ụmụ ụmụ Ifrem
20 Ụmụ Ifrem bụ
Shutela, Bered,
Tahat, Eleada,
Tahat 21 na Zabad nwa ya,
na Shutela nwa ya.
Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ. 22 Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi. 23 Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza. 24 Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
25 Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef,
onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
26 onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud,
onye bụ nna Elishama. 27 Elishama bụ nna Nun,
onye bụ nna Joshua.
28 Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha. 29 Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
Ụmụ ụmụ Asha
30 Asha mụrụ ndị a:
Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
31 Beriya amụta ndị a:
Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
32 Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
33 Ụmụ Jaflet mụrụ bụ
Pasak, Bimhal na Ashvat.
Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
34 Shoma amụọ
Ahi, Roga, Huba na Aram.
35 Nwanne ya nwoke Helem mụrụ
Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
36 Zofa amụta ndị a:
Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra, 37 Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38 Jeta mụtara
Jefune, Pispa na Ara.
39 Ụla amụta
Ara, Haniel na Rizia.
40 Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.