3
Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya
nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya.
Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.
Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile
na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya,
m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya.
Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
Ndị nche na-eche obodo* hụrụ m,
mgbe ha na-agagharị nʼobodo,
ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”
Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha,
achọtara m onye m hụrụ nʼanya,
ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka
tutu m duta ya nʼụlọ nne m,
nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,
unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta
ruo mgbe o masịrị ya.
 
Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa
dịka anwụrụ ọkụ,
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,
ụda nke ndị ahịa na-ere?
Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.
Iri mmadụ isii ndị ọka agha,
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
Ha niile ji mma agha;
ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.
Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,
ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a
nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
10 Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee;
ala ya bụkwa ọlaedo.
Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa,
e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya.
Ndị inyom Jerusalem, 11 pụtanụ,
bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn,
bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze;
lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi,
nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya,
nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
* 3:3 3:3 Aịz 21:11-12