4
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya,
e, ị mara mma!*
Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu
nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.
Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ,
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.
Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie.
Ọnụ gị dị mma ile anya.
Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet e kere abụọ.
Olu gị dị ka ụlọ elu Devid,
nke e wuziri nke ọma.
E konyere puku ọta na ya,
ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.§
Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ,
nke otu nne mụrụ nʼotu oge,
ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.
Tutu chi ụtụtụ abọọ,
tutu onyinyo agbalaga,
aga m aga nʼugwu ụda máá
na nʼugwu insensi.
Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,
ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ.
 
Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.
Si na Lebanọn bịa soro m;
rịdata site nʼugwu Amana,
nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon,
site nʼọgba ọdụm
nʼugwu niile ebe agụ bi.
I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
i riela m obi,
i werela ile anya gị
na ihe olu i yi rie obi m.
10 Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya,
isisi ụtọ nke mmanụ otite gị
na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.
11 Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m,
mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị,
isisi ụtọ nke uwe gị
na-esi ka Lebanọn
12 Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ.
Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.
13 Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet
nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa,
nke nwere henna na naad,
14 naad na safron,
kalamus na sinamọn,
na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
na ụda máá, na aloos
na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
15 I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige,
olulu mmiri dị ndụ
nke si na Lebanọn asọdata.
Onye a hụrụ nʼanya
16 Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu;§
bịakwa gị ifufe si na ndịda,
fekwasị ubi m a gbara ogige,
ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile,
ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige,
ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.
* 4:1 4:1 Abk 1:15; 5:12 4:1 4:1 Igwe ewu ndị a dị ojii. 4:3 4:3 Pomegranet na-acha uhie uhie. § 4:4 4:4 Neh 3:19 * 4:7 4:7 Efe 5:27 4:12 4:12 I ji debe olulu mmiri ọcha, ka ọ ghara ịgwọtọ, a na-emere ya okwuchi. Ma ọ bụrụ isi iyi, a na-akpa ihe mgbochi ka ndị mmadụ ghara iru nʼebe elu elu ya mgbe ha na-ekute mmiri. 4:15 4:15 Mgbe mkpụrụ mmiri nke kpuchiri ugwu Lebanọn na-agbaze, mmiri ya na-asọdata sọbanye nʼime ọtụtụ isi iyi, mee ka isi iyi ndị ahụ ghara ịta ata. § 4:16 4:16 Ọ bụ ifufe na-esite na mpaghara ugwu, nke na-efe nwayọọ na-eme ka mkpụrụ dị ọhụrụ, maa mma. Ma nke na-esite na ndịda, na-ebute okpomọkụ na-eme ka mkpụrụ ndị a chaa nke ọma. Ikuku abụọ ndị a bụ ihe na-ekusasi ezi isisi nke okoko ahịhịa dị nʼubi a gbara ogige.